Onye ịsị oche ụlọ ọrụ n'alụ agha megide mpụ igwu chandum, EFCC na mkpirisi bekee, Ola Olukoyede, ekpughela ka onye isi ụlọ ụka Redeemed Christian Church of God, RCCG, Ụkọchukwu Enoch Adeboye, jiri nye ntụziaka ka akwụghachi ego ndi akwụnyere na-akpa ego ụlọ ụka ahụ, nke ezutere n'ohi, bụ nke ọnụ ego ya ruru ọtụtụ ijeri naira.
Olukoyede kwuru nkea n'otu ememme na Satọde gara-aga, Nọvemba 7, nke ịsị okwu ya metụtara mpụ na ụlọ ụka Kraịst. Ọ rụtụrụ aka, na ọtụtụ ndi ọgaranya na ndi ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-eji ụlọ ụka Kraịst ezocha ego ha zutere n'ohi.
Ọ gara n'ihu kọwa, na ụlọ ọrụ EFCC nyochapụtara ụfọdụ ego ndi ahụ gaa n'akpa ego ụlọ ụka RCCG, nke mere ka ha degara Ụkọchukwu Adeboye edemede banyere nchọpụta ha. Dika o kwuru, Ụkọchukwu Adeboye arụghi ụka ọbụla maọbụ gbalia ịkpuchi ndi ahụ nyere ego onyinye ahụ, kama, o nyere ntụziaka ka ndi ha na ya so arụ ọrụ kwụghachi ego ahụ ozugbo.
Ọnye ịsị oche ụlọ ọrụ EFCC kọwara, na Ụkọchukwu Adeboye kwụghachiri ọtụtụ ijeri naira ndi ahụ nihina ọ chọghi ka ụlọ ụka Kraịst jiri ego ezuru n'ohi arụrụ Chineke ọrụ - na ụlọ ụka Kraịst agaghị edebe ego n'adịghị ọcha; kama, ka ahapụrụ gọọmenti ego ahụ n'aka ị mee ihe ọbụla masiri ha.