Aka chibụrụ steeti Lagos n'oge ọchịchị ndị agha ma bụrụ kwa aka chibụrụ steeti Osun n'oge ọchịchị ndị nkịtị, Olagunsoye Oyinlola, ekwuola ugbua na ọ bụ agụụ obi ọtụtụ ụmụ afọ ala anyi Naijiria ka onye n'emebeghi agadi bụrụ onyeisiala n'afọ 2027, bụ onye a pụrụ ịlekwasi anya ịnya ụgbọ mba Naijiria gaa ala di mma.
Oyinlola kwuru, na afọ ole mmadụ di kwesiri ị bụrụ otu ihe di mkpa aga elekwasi anya oge mmadụ na-achọ ịzọ ọkwa ọchịchị, ma jiri ohere ahụ kpọkuo onyeisiala Bola Tinubu na kwa osote onyeisiala n'oge garaaga, Atiku Abubakar, ịhapụ achụmnta nkwado ha maka ọkwa onyeisiala, iji kwe ka ndi n'emebeghi agadi nọrọ n'isi ọchịchị ala anyi Naijiria.
N'ọzọ yiwere ibe ya, ememme ọgbakọ achụmnta nkwado ọkwa onyeisiala nke pati APC n'ime steeti Nasarawa ụnyaahụ, bụrụ nke tịgbuo-zọgbuo hiri odo na ya, dika ụfọdụ ndị ntorọbia yị uwe pati APC malitere ịgụ egwu nkwado nke onye g'eji aha pati SDP zọọ ọkwa gọvanọ n'ime steeti ahụ. Ọgbakọ achụmnta nkwado a, nke osote onyeisiala Kashim Shettima nọrọ na ya, ka a nọọ na ya merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ, ebe ụfọdụ ka n'efu efu k'ọdi ugbua.