Obi onye ịsị ala ekwuola ugbua, na onyeisiala Tinubu ga ahapụ Abuja taa bụ Tọzdee gawa Makkah, mba Saudi Arabia, iji sonye n'ekpere okpukpe alakwụba Umrah. Obi onye ịsị ala kwụpụtara nkea site n'otu ozi onye ndụmọdụ pụrụ iche onyeisiala n'okwu mgbasaozi na atụmatụ, Bayo Onanuga, wepụtara ọhaneze.
Dika ozi ahụ jiri kọwa, njem ahụ ga-enye onyeisiala Tinubu ohere itụghari uche ime mmụọ, na kwa ikpere ala anyi Naijiria ekpere maka udo, ịdị n'otu na ọganihu nke n'adigide adigide. Ọ gbakwụnyere, na-anatụ anya onyeisiala Tinubu ilọghachi ala anyi Naijiria n'izu ụka ọzọ.
Ma k'ọdi, onye g'eji aha pati AAC zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2027, Omoyele Sowore, akọwala ozi ahụ dika okpokpo asi, ma boo ebubo, na dika n'oge nke onyeisiala n'oge gara aga nwụrụ anwụ, Umaru Musa Yar'Adua, na otua ka ọ di kwa n'oge nke Tinubu. Ọ rụtụrụ aka, na n'oge Yar'Adua, ọ nọrọ n'aga mba Germany iji nata ọgwụgwọ ahụike ya ruo oge ọ gara mba Saudi Arabia, kpọ oku, ka ọhaneze kpere onyeisiala Tinubu ekpere, bụ onye nọrọla kemgbe aga mba France iji nata ọgwụgwọ ahụike ma na-achọ ugbua i gaa mba Saudi Arabia dika Yar'Adua gara.