Onyeisiala Bola Tinubu ekweghachila nkwa ọzọ ị nyepụ ọkụ eletrik nke n'adịghị anyụ anyụ nani afọ anọ gara aga ugbua mgbe ọ mara ọhaneze aka, ka ha jụụ ịtụnyere ya votu ya bụrụna ọ laa azụ na nkwa ị nyepụ ha ọkụ eletrik nke n'abụghị pinyụọ pinyụọ n'ọchịchị afọ anọ mbụ ya.
O kwere nkwa ọhụrụ nke a ụnyaahụ, Tuzde, Nọvemba 10, n'otu ọgbakọ achụmnta nkwado pati APC na Dutse, Steeti Jigawa, bụ ebe ọ nọọ gụpụta ụfọdụ atụmatụ ọchịchị gọọmenti ya nwere maka ala anyi Naijiria ya bụrụna e nye ya ohere ọzọ n'afọ 2027. N'ebe ahụ ka ọ nọọ kwe nkwa ịlụ agha megide ihe ịma aka nile mere ka ọkụ eletrik ghara ị bụ nke n'adịghị anyụ anyụ, ma belata ọnụ ego eji azụ ngwa ahia.
Ma k'ọdi, nkwa ọhụrụ a n'okwu metụtara ọkụ eletrik, akpọghachila akọnuche ọhaneze azụ n'oge achụmnta nkwado ya na steeti Lagos n'afọ 2022 maka ọkwa onyeisiala afọ 2023, bụ mgbe ọ mara ụmụ afọ ala anyi aka, ka ha ghara ikwado nghọpụta nke ugboro abụọ ya, ya bụrụna ọ daa ịnyepụ ọkụ eletrik bụ kpoo.