Onye g'eji aha pati NDC zọọ ọkwa onye ịsị ala n'afọ 2027, Peter Obi, agọnahụla ịde edemede n'ekesa ugbua nke e degara Obi nke Ọnitsha, Igwe Nnaemeka Alfred Ugochukwu Achebe, dika dọga dọga okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke ịji ụgwọ ego n'etiti gọọmenti steeti Anambra na Mazi Peter Obi, ka n'ehi odo.
Peter Obi kọwara edemede ahụ dika akụrụ-akụ, ma kpọkuo ọhaneze na ụlọ ọrụ mgbasa ozi, ileghara edemede ahụ anya, nihina ọ bụ nke nduhie na aka ọrụ ndị osochi egbu.