Aka chibụrụ steeti Kano, Rabiu Musa Kwankwaso, akọwala na onye g'eji aha pati NDC zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2027, Mazi Peter Obi, agaghị aritu na achụmnta ya izọ ọkwa onyeisiala iji kwado pati ADC maọbu pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ. Kwankwaso kwuru nkea n'otu ozi o wepụtara ọhaneze site n'ọba social media X ya.
Onye a g'eji aha pati NDC zọọ ọkwa osote onyeisiala, Kwankwaso, nọrọ na-aza ajụjụ banyere nkatọ otu achụmnta nkwado pati ADC katọrọ nihi nkwadebe ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'abụghi nke pati APC n'eme banyere ntụliaka elu ozuru ala anyi ọnụ nke afọ 2027. O boro ebubo, n'otu achụmnta nkwado pati ADC na akatọ Mazi Peter Obi na pati NDC n'ụzọ n'adabaghi adaba karia ichewe ihu ha n'irepụ ahia ha kpọsara, Atiku, nye ọhaneze ala anyi Naijiria. Kwankwaso jiri ohere ahụ gọnahụ ebubo na pati NDC na-arụrụ onyeisiala Tinubu ọrụ, ma rụtụ aka na pati ya NDC, ka di uchu n'agụụ obi ha izọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2027.
Aga echeta na pati ADC kwuru okwu ndi ha kwuru nihina Kwankwaso kpọkuru osote onyeisiala n'oge gara aga, Atiku Abubakar, irituru Peter Obi maka ntụliaka elu afọ 2027. Pati ADC we boo ebubo, na Kwankwaso na achụso ọdịmma onwe ya nihi agụụ obi izọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2031 karia ichụso idi n'otu nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndi n'abụghi nke pati APC maka ntụliaka elu afọ 2027