Onye n'eme ejije n'ala anyi ama ama nke ọma, Francis Duru, anwụọla ugbua oge ọ gbachara afọ ịrị ise n'asaa. Ndị ezinụlọ ya kwupụtara ọnwụ ya site n'ọba social media Instagram ya n'isi ụtụtụ taa, ma kpughe na ọ nwụrụ oge ọriatụchara obere ọria.
Ndị ezinụlọ ya kelere ọhaneze maka ekpere ha, ịhụnanya ha, na nghọta ha, ma kpe ekpere ka mkpụrụ obi ya zuo ike n'udo.
Aga echeta, na n'ọnwa Juun afọ a, onye a n'eme ejije gọrọ siri siri siri nke n'ekesa oge ahụ na ọ na-aria otu nnukwu ọria. Ọ kọwara ozi ahụ dika okpokpo asi na nke n'eduhie eduhie.
Amụrụ Francis Duru n'abali ịrị abụọ n'asaa nke ọnwa Julaị afọ 1969 n'ime mba Cameroon. Nne na nna ya sitere steeti Imo. Ọ nọrọ na mba Cameroon gụcha agụmakwụkwọ praịmarị ya tụpụ ọ lọbata n'ala anyi Naijiria.
Ọ gụrụ ihe ọmụmụ Theatre Arts n'ụlọ mahadum di na Portharcourt , ebe n'ime afọ 1989 ka ọ mere ejije nke mbụ ya aha ya bụ "Missing Mark".