Ọchịchị etiti akwụsila ndi nchekwa Civil Defence mmadụ ịrị abụọ ọrụ ugbua, nihi ọnwụ ike ndị mkpọrọ mmadụ ịrị atọ n'asaa ahụ ndi nwụrụ n'ụlọ mkpọrọ ndi ọrụ nchekwa Civil Defence na Minna, steeti Niger.
Ndị mkpọrọ ahụ, bụ ndi anenyo enyo n'egwupụta akụ ndi n'ime ala n'ụzọ iwu n'akwadoghị, ka akpọchịrị n'ọnụ ụlọ mkpọrọ di obere, bụ ebe ha nọọ nwụọ nihi enwetaghị ikuku n'ụzọ kwesiri ekwesi.
Onye minista n'ahụ maka ihe ndi n'eme n'ime ala anyi, Olubunmi Tunji-Ojo kwupụtara nkwụsi ọrụ ndị ọrụ Civil Defence mmadụ ịrị abụọ ahụ, ma kwe nkwa ị mee nyocha tara ọchịchị ịjị mara ka mmiri jiri banye n'opi ụgbọghọrọ.
Ọchịchi etiti ehiwela otu nyocha mmadụ ịrị ị mee nyocha ha n'ime ịzu abụọ, ịjị nyepụ ndị nile aka ha di n'arụ ahụ ntaramahụhụ kpụ ọkụ n'ọnụ.
Akụkọ Ọhụrụ
Ọchịchi etítì ehiwela otu nyocha mmadụ iri ì mee nyocha nihi ọnwụ ndi mkpọrọ mmadụ iri atọ n'asaa na steeti Niger
Ọchịchi etiti nyere ha ịzu ụka abụọ ipiachi nyocha ahụ, iji mara ka ihe mere jiri mee