Obi nke ala Ọnitsha, Igwe Alfred Nnaemeka Achebe, akpọkuola ndị Igbo nọọ na mpaghara South-East ịpụta n'igwe ma sonye tụọ votu n'afọ 2027, dọọ aka na nti, na-apụtaghị n'igwe tụọ votu ga-eme ka mpaghara South-East ghara ịnwe agba ma bụrụ ide n'okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'ala anyị Naijiria.
Onye eze ọdịnala ahụ mere ọkpụkpọ oku ahụ ụnyaahụ bụ Fraidee, Ọktoba 16, n'oge ememme Ọfala nke afọ a, nke hiri odo n'ogbe Eze Chima Square di n'ala Ọnitsha, steeti Anambra. Ememme ahụ nke akpọkwasiri ịsị okwu ya "Ọga n'iru, nke akpachapụrụ anya n'eme," ka eji echeta ihe karịrị afọ narị ise obi eze Ọnitsha malitere ihi odo.
Igwe Alfred Achebe riọrọ ndị Igbo imeri ejighi ntụliaka elu kpọrọ ihe nke ejirila we mara ndị Igbo kemgbe gboo, kọwa, na ndị Igbo apụghị ime mkpesa na anaghị emenyere ha dịka agbụrụ ndị ọzọ oge ha anaghị enwe mmasị na ntụliaka elu. Ọ gara n'ihu gbakwụnye, na n'ọchịchị onye kwuo uche ya, votu ọbụla atụrụ di oke mkpa, kpọkuo ndị Igbo ipụta tụnyere onye masịrị ha votu n'afọ 2027.
Igwe Achebe jiri ohere ahụ kpọkuo ụlọ ọrụ INEC, ihazi ntụliaka elu nke wuruwuru nrụrụaka agaghị ehi odo na ya, ma kpọkuo kwa ọchịchị gọọmenti etiti nke onyeisiala Tinubu nọọ n'isi ya, ijiri ọdịmma ndi ogbenye na ndị n'enweghi onye enyemaka kpọrọ mkpa, ọkacha kwa ugbua ọnọdụ ihe ịsị-ike, ọnọdụ enweghị nchekwa, enweghị ọrụ na nlekọta ahụike erughi aka ndị ogbenye, bụzi chibọ anụ ọzọ n'ala anyị.