Nwata nwokorọbia nke na-agbara otu Arsenal bọlụ, Ethan Nwaneri, enwela nchegharị nke obi ugbua dika ọ na-atụ atụmatụ ịhapụ otu egwu bọlụ mba England ma sonye nke mba Naijiria, nke merela ka otu Super Eagles nwe olileanya gbapụtara ihe na Nwaneri ụkwụ na-aghọ nkọ na bọlụ, ga-agbara ala anyi bọlụ n'oge n'adịghị anya.
Nwokorọbia a gbara afọ ịrị n'itolu, nọọ ugbua n'otu Borussia Dortmund nke mba Germany, bụ ebe ọ nọọ na mbinye otu afọ site n'otu Arsenal. Na-agbanyeghi na ọ gbarala mba England bọlụ n'ogo dị icheiche nke otu ndị n'etolite etolite, onye ọzụzụ otu Super Eagles, Eric Chelle, gara obodo London gaa zute ndị nnọchiteanya Nwaneri iji nwe mkparitaụka ma wụlie mmụọ ya isonye otu Super Eagles nke ala anyi Naijiria.
Amụrụ Nwaneri n'ime mba England. Nna ya bụ nwa afọ ala anyi, ebe nne ya bụ nwa afọ mba England na France. Dika ọ gbarala mba England n'ogo otu bọlụ afọ ịrị n'isi, ịrị n'asaa, ịrị n'asatọ na afọ ịrị abụọ n'otu, Nwaneri apụghị isonyere otu Super Eagles ozugbo n'ebughi ụzọ nata ikike site n'aka otu FIFA.