Nje ọria Ebola abatala mba Naijiria ọzọ kwa dika otu nwanyị sitere mba Uganda lọbata n'ala anyi, ka nyocha ahụike n'ụlọ ọgwụ Nizamiye di n'Abuja gosipụtara na o buu nje ọria ahụ. Amatabeghi ka nwanyị a si we bute nje ọria Ebola tupụ ọ bata n'ala anyi Naijiria.
Ma k'ọdi, ụlọ ọrụ ahụike ala anyi amalitela i mee nyocha nihi ka nwanyị ahụ jiri gosi ihe ịgba ama na o sitere mba Uganda we lọbata. Ụlọ ọrụ ahụike ala anyi amalitela ichụso mmadụ iri anọ n'anọ nwanyị a zutere kemgbe ọ lọbatara ala anyi Naijiria.
Ọnọdụ a ewetala obi erughi ala ugbua na ọbụ ihe pụrụ omume na nje ọria Ebola pụrụ ịtiwapụ ọzọ kwa n'ala anyi Naijiria, dika ụlọ ọrụ ahụike amalitela i mee ihe nile ha pụrụ ị mee iji hụụ na nje ọria ahụ ekesaghi gaa n'ihu. Nje ọria Ebola tiwapụrụ n'ala anyi nke mbụ n'afọ 2014 oge otu onye njem sitere mba Liberia bubatara nje ọria ahụ, dika mmadụ asatọ nwụrụ n'oge ahụ.
Nje ọria Ebola bụ nje di oke egwu nke n'ebute ọnwụ. Ana ebute ya site na mmekọ ọbara maọbụ mmiri ahụ ndi ọzọ sitere n'ahụ onye buu ọria ahụ, maọbụ site n'imetụ ihe onwunwe ndi dika akwa oyiyi nke metụrụ n'ahụ onye buu nje ọria ahụ.
Ihe ndi n'egosipụta na mmadụ buu nje ọria Ebola gụnyere: ahụ ọkụ, ike ọgwụgwụ, ahụ mgbu, ịsị ọwụwa, na akpiri ifụ ụfụ. N'ụfọdụ ndi ọzọ, ha pụrụ ịgbọ agbọ, ị nwe afọ ọsịsa, ihe ịtopụta n'elu ahụ ha, na ọbara ịgba ha n'elu ahụ maọbụ n'ime ahụ.