Ndi bị n'obodo Maburya n'ọchịchị council Mariga nke steeti Niger, akwụọla ndi omekome n'eyi ndụ egwu ụtụ ego ruru nde naira abụọ n'ụma ịsị, bụ ụtụ eji ike napụ ha na Fraide gara aga, Nọvemba 13. Ma n'oge n'eteghi aka, ha kpọkuru ndi obodo ahụ ọzọ, na-achọ kwa ego ọzọ, dọọ ha aka na nti, na ya bụrụna akwụghị ego ahụ, ha agaghị ekwe ha ị gaa kọọ ugbo ha.
Ndi bị n'obodo a anọrọla ọtụtụ oge ugbua zute nyija na iji ike anara ha ego site n'aka ndị omekome, bụ ndi eboro ebubo na-anapụ ha ọgba tumtum ha, ekwentị na ego ha.
Ọnọdụ a emela ka ọtụtụ mmadụ malite ịjụ ajụjụ banyere uru nkwekọrịta udo n'etiti ndị obodo na ndi omekome bara, ọkachakwa n'ọnọdụ ndị obodo n'ezute nyija obibi ndụ ha na enweghịri onwe ịgaghari ka ha si chọ.
Ọnọdụ ndi omekome ịmachibido ndi ọrụ ugbo ị gaa n'ubi ha, ga-akpali ihe ịsị-ike n'etiti ọhaneze, bụ ndi ọtụtụ n'ime ha ji ịkọ ugbo mere ọrụ ha ji akụta ego.