Mgbawa ọkụ nọrọ na mgbede ụnyaahụ, Tọzdee Ọktoba 15, gbapụ n'obodo Aleto, n'ọchịchị council Eleme nke steeti Rivers, merụọ mmadụ ịrị abụọ ahụ ma repia ụlọ ịrị ise. Njiji ahụ jiri n'oge okporo mmanụ petrol ụlọ ọrụ Nigeria Gas nwe, gbawara n'okporo ụzọ awara-awa Old Bori di na Aleto.
Ọtụtụ ndị mmadụ nkea metụtara ka ebujere ụlọ ọgwụ di iche iche, ebe ụlọ ahia di iche iche na ụlọ ọrụ ana nọọ na ya emezi ụgbọ ala, bụ ebe ọtụtụ ụgbọ ala nọọcha na ya, ka ọkụ mgbawa ahụ metụtara.
Onye ndu Eleme Legislative Council, Daniel Chuma, onye biara n'ebe njiji ahụ jiri, kọwara akụkọ a dika nke mere eme, ma rụtụ aka, na o degarala ndi ụlọ ọrụ Nigeria Gas edemede banyere okporo mmanụ ahụ nke n'ehi ehi, ma mee kwa mkpesa gaa n'aka ụlọ ọrụ ndi n'ahụ maka ụdịrị ọnọdụ a, mana ha emeghị ihe ọbụla banyere ya. Ọ gara n'ihu rụtụ aka, na ha mechara kpọ oku ka eme nyocha ejikọtara aka ọnụ mee, mana ha amaghị ma enwere ihe ha mere banyere ya, ruo ụnyaahụ mgbawa ọkụ ahụ tiwapụrụ.
K'ọdi, ndị ọnụ n'eru n'okwu, gụnyere Dr Fyneface Dumnamene, akpọla oku ka gọọmenti n'ogo ọbụla gbatara ndi nkea metụtara ọsọ enyemaka.