Osote onyeisiala n'oge gara aga ma bụrụkwa onye g'eji aha pati ADC zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2027, Atiku Abubakar, eboola ebubo na ọchịchị gọọmenti onyeisiala Bola Tinubu akụọla ọyụpa ịnye ngụkọ gbasara ijeri naira ịrị ha mawapụtara n'ọnwa Juun afọ a maka iji kwadebe maka igbochi mbubata maọbụ nkesa nje ọria Ebola n'ala anyi, ma kọwa, na ha adala n'ọrụ ha ugbua igbochi mbubata nje ọria ahụ n'agbanyeghi na ha mawapụtara ijeri naira ịrị maka ya.
Ọ kpọkuru ọchịchị gọọmenti etiti ịkwupụtara ọhaneze ọnụ ego ha kesarala, ụbọchị ha kesara ya, ndị ha kesara ya gaa n'aka ha, na kwa ngwa ahụike ndi ha kesarala. Ọ gbakwụnyere, na ya bụrụna enyepụbeghi ego ahụ kemgbe ọnwa Juun gaa n'aka ụlọ ọrụ ahụike, onyeisiala Tinubu kwesịrị ịpụta kọwara ọhaneze ihe mere ha jiri kwupụta ego gbata-gbata mberede nke n'eruteghi aka ndị ọ di n'aka ichekwa ahụike ọhaneze.
Ọ gbarụrụ ihu ka eji mee onye ịsị ndị ọrụ onyeisiala, Femi Gbajabiamila, onye ịsị oche otu ọtawiike onyeisiala n'okwu nje ọria Ebola, onye nke n'abụghi onye ọrụ ahụike nke oji abụ onye ịsị ụlọ ọrụ Nigeria Centre for Disease Control and Prevention.
Atiku Abubakar bookwara ebubo, na enwere atụmatụ mgbasa ozi ụlọ ọrụ ahụike ala anyi n'atụ atụmatụ ya igbasara, ọhaneze, ka akwụsi izukọta ọnụ n'igwe n'oge ememme achụmnta nkwado pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị na kwa n'oge ịtụ votu. Ọ dọrọ ọchịchị gọọmenti onyeisiala Tinubu aka na nti, ka ha ghara iji akụkọ ntịwapụ nje ọria Ebola yịja ndụ ọhaneze, mechie ọnụ ndị n'esoghi ha na gọọmenti, maọbụ ịgbochi ndi mmadụ ịsonye n'oge ntụliaka elu afọ 2027.