Aka chibụrụ ala anyi Naijiria n'oge gara aga, Olusegun Obasanjo, akatọla ụkpụrụ mgbanwe akụnaụba ndị ọchịchị gọọmenti onyeisiala Tinubu mawapụtara, boo ebubo, na ọchịchị gọọmenti ya emela ka ọnọdụ ihe ịsị-ike dinyekwu njọ n'ala anyi, nihi nwepụ ego enyemaka mmanụ petrol subsidy na kwa nke ịkụ ọyụpa ego naira n'ahia mgbanwe ego mba ụwa.
Obasanjo kwuru nkea na Tọzdee izu a n'obodo London n'otu ọgbakọ Financial Times Africa haziri, ma jụọ ajụjụ banyere mmetụta ụkpụrụ mgbanwe akụnaụba afọ 2023 nke ọchịchị gọọmenti Tinubu nwerela na ndụ ọhaneze. Ọ gara n'ihu rụtụ aka, na ịkụ ọyụpa ego naira emela ka ọhaneze ala anyi Naijiria nọrọ n'ahụ ụfụ ịzụta ngwaahịa ma mee ka ọnụ ego eji azụta ihe oriri gbagoro elu ọjị.
Olusegun Obasanjo kọwara ala anyi Naijiria dika "ịsị obodo ụbịam n'ụwa dum", ma kọwaa, na ụkpụrụ mgbanwe akụnaụba onyeisiala Tinubu wepụtara, emela ka ọtụtụ mmadụ daa ogbenye. Ọ gbarụrụ ihu, na gọọmenti etiti Tinubu nọọ n'isi ya, na-ariọ ka enyetukwuo ha oge iji hụụ mkpụrụ-ọma ụkpụrụ mgbanwe ha, ma gbakwụnye, na ya apụghị ị hụụ ka ọnọdụ akụnaụba n'okpuru ọchịchị gọọmenti Tinubu g'eji di mma ma ncha.
Aga echeta, na kemgbe onyeisiala Tinubu nọdụrụ ala n'oche ọrụ n'ọnwa Mee afọ 2023, na ọ nọrọla ekwupụta nkwado nye ụkpụrụ mgbanwe akụnaụba ndi ọ mawapụtara, ma kọwaa ha dika ụkpụrụ ndi kwesiri ekwesi igbanwe ọnọdụ akụnaụba ala anyi nke ga-eme ka ndị nwunye-ihe nwe agụụ ịbata n'ime mba Naijiria.