Onyeisiala Bola Tinubu natara ịtị mkpu ọjụjụ site n'aka igwe mmadụ oge n'eteghi aka o sonyechara n'ekpere n'ụlọ ọgbakọ alakwụba Shagari arụghariri ọhụrụ. Nkea mere ụnyaahụ, Fraide, Nọvemba 13, na Area 1, Garki, Abuja.
Ozi anyi nwetara site n'aka ndị hụrụ ihe merenụ, kọwara, na ụfọdụ ndi mmadụ malitere iti mkpu 'Bamayi' oge onyeisiala chọrọ ịpụ n'ogbe ọgbakọ alakwụba ahụ dika o sonyechara n'ekpere.
'Bamayi' bụ okwu Hausa, nke ha ji ekwupụta anabataghi mmadụ maọbụ ekwenyeghiri mmadụ.
Ụfọdụ n'ime ha ka-ahụrụ ebe ha na-atụ ụgbọ ala ahiri onyeisiala Tinubu okwute na kwa ihe ndi ọzọ. Onyeisiala Tinubu sonyeere n'ekpere Jumat ahụ n'ụlọ ọgbakọ alakwụba arụghariri ọhụrụ, bụ ebe onyeisi okpukpe Imam, Rabiu Suleiman, kwusara okwu Chukwu nke hiwere isi n'okwukwe, ntụkwasiobi n'ebe Chineke nọọ, na kwa ọdị mkpa udo di. Onye Imam ahụ kpe kwara ekpere ka Chineke nye onyeisiala amamihe idu ala anyi Naijiria.
Ma k'ọdi, ọnọdụ gbanwere oge ekpechara ekpere, dika igwe mmadụ zukọrọ gburugburu ụlọ ọgbakọ alakwụba ahụ iji kwupụta iwe ha.
Iti mkpu 'Bamayi' ahụ, na-egosipụta ka ọhaneze ala anyi Naijiria ji enweghị afọ ojuju n'ebe ọchịchị gọọmenti onyeisiala Tinubu nọọ kemgbe afọ 2023 ọ malitere ụkpụrụ akụnaụba ndi merela ka ọnọdụ ihe-isi ike dinyekwuo njọ.