Otu onye bubụrụ onye ịsị ndị agha soja n'ala anyi, Umar Aliyu, onye nke eji 'Captain Blade' we mara nke ọma, akọwala ugbua, na ndị omekome n'eyi ndụ egwu, na-atọkari ute dịna na nso ebe mmiri di n'ime oke ọhia, ma rụtụ aka, na enwere mmiri iyi n'ime ọhịa Sambisa.
Ọ gara n'ihu kọwa, na ya bụrụna ndị agha agbasapụ onwe ha ma chọ ndi omekome ahụ n'ihe dika otu kilomita maọbụ abụọ n'akụkụ mmiri iyi di n'ime ọhia Sambisa, na ha ga ezute ndị otu omekome Boko Haram.
Captain Blade kwuru n'eze wara-awa, na ọbụghi ihe rara ahụ ịchọta ndị omekome a n'eyi ndụ egwu, nihina ya bụrụgodi na ha awụba n'ime oke ọzara maọbụ ọhia, na ha ga-achọ ịrị nri, nke pụtara, na ha ga-anọriri na nso akụkụ mmiri iyi.