Onye nta akụkọ n'ụlọ Channels TV, Seun Okinbaloye, etiela mkpu n'oke olu banyere ntụliaka elu afọ 2027, ma rụtụ aka, na emela nrụrụaka okwe ntụliaka elu ahụ kemgberi, nke pụrụ ịtinye usoro ntụliaka elu ahụ na ọghọm ya bụrụna ụlọ ọrụ INEC emeghị ihe ngwangwa ma zacha akwụkwọ ndebanye aha ndị ga atụ votu.
Seun Okinbaloye kwuru nkea n'otu ihe omume ụlọ ọrụ Channels TV, ma boo ebubo, na ihe ịgba ama n'egosipụta na ndi ndọrọ ndọrọ ọchịchị emetụla aka ọjọ ha n'akwụkwọn ndebanye aha ndi n'atụ votu, dika achọpụtara aha ụmụaka ndi n'etorubeghi ịtụ votu, aha ndi gbara abụọ, na kwa aha ndi ana-apụghi ịkọwapụta ma ha bụ mmadụ, bụcha ndi ahụrụ n'ime akwụkwọ ndebanye aha ndi ga atụ votu.
Ọ kpọkuru ụlọ ọrụ INEC, ịmalite ozugbo nyocha ma zacha akwụkwọ ndebanye aha ndi n'atụ votu, iji wepụ aha ndi ekpojuru na ya n'abụghi mmadụ, ndi nke nwụrụla anwụ, na kwa ndi nke ka bụ ụmụaka ndi n'etorubeghi ịtụ votu. Ọ kpọkukwara ọhaneze ala anyi Naijiria, ka ha ghara ịchere ruo ụbọchị aga atụ votu ikwa akwa nrụrụaka wuruwuru ntụliaka elu, nihina amalitela iwunye ntọala nrụrụaka ntụliaka elu ahụ kemgberi site na wuruwuru akwụkwọ ndebanye aha ndi n'atụ votu.
Kọdi, ụlọ ọrụ INEC ekwuola ugbua, na ha amalitela izacha na ihicha akwụkwọ ndebanye aha ndi n'atụ votu, bụ nke ha chọpụtara ọtụtụ aha ndi eji ngwa AI we kpụgharia.