Ọnụ n'ekwuru otu achụmnta nkwado ọkwa onyeisiala Mazi Peter Obi, Zekeri Idris, ekwuola ugbua, na ndị nkwado n'esoghari Peter Obi, ka ana-anwa ọnwụnwa oge nile ịgbahapụ ya, bụ ọnwụnwa nkwutunkwu ego.
Ọ kwuru nkea n'otu ihe omume mgbasa ozi 'Morayo Show', bụ ebe ọ nọọ kwuo okwu banyere ịguzosi-ike n'ikwado mmadụ, ịguzosi-ike n'eziokwu, na kwa ihe ịma aka di n'ikwado mgbanwe ọhụrụ n'ọkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'ala anyị Naijiria.
Zekeri Idris kwuru, na n'agbanyeghi nnukwu ego ana-enye ha iji gbahapụ Peter Obi, na ọtụtụ n'ime ha jụrụ ma si mba, ma rụọ ụka, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ala anyị chọsiri ike ndị mmadụ ndi pụrụ ịjụ chandum ma gosi ịdị uchu n'ọrụ obodo n'agbanyeghi ihe nweta na ego ha pụrụ ịnata.
Ọnụ n'ekwuru Mazi Peter Obi gara n'ihu kọwa, na mba ọbụla nke mechara tie ịgba n'okwu ọchịchị gọọmenti, nwetara nanị otu onye nke pụrụ ịsị 'Nkea agaghị aga n'ihu. Agam agbanwe ya,' dika Mazi Peter Obi n'eme ugbua iji gbanwee ụkpụrụ ọjọ ndi desara ala anyị n'ọnọdụ ọ nọọ k'ọdi ugbua.