Adọkpụrụla otu nwa nwoke Nyesom Wike, Jordan Ezenwo Wike, pụọ ụlọ ọrụ EFCC ugbua nihi ebubo igwu chandum ego ala nke ọnụ ego ya ruru nde dollar abụọ n'otu ụma. Adọkpụrụla ya gawa ụlọ ọrụ EFCC nihi enyepụghi ala akwụrụ ya ego maka ya n'Abuja nke megidere nkwekọrịta ha bịanyere aka na ya.
Nkea na-abia dika mmadụ abụọ mere mkpesa ahụ megide Jordan Wike, Safwan Garba GY na GY Global Oil and Gas Nigeria Limited, dọkpụrụ ya pụọ ụlọ ikpe nihi ebubo igwu chandum ego ala ahụ. Ozi anyị nwetara na-akọwa, na ndị ahụ mere mkpesa, na-arịọ ụlọ ikpe ị nyere aka nataghachi Jordan nde dollar abụọ n'otu ụma ahụ o jiri ụzọ wuruwuru chandum napụ ha, dika ha boro ebubo, na ọ bụ ego ala ha kwụrụ ya ụgwọ ya na Katampe na Guzape.
K'ọdi, onye ọka ikpe ụlọ ikpe ukwu ahụ, Silvanus Oriji, ebujela okwu ikpe ahụ gaa abali mbụ nke ọnwa Disemba afọ a, iji nụrụ mkpesa mmadụ abụọ ahụ nwere megide Jordan Nyesom Wike.